Numbers 12

Miriam na Erọn eguzo megide Mosis

1Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush. 2Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.

3(Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)

4Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara. 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso. 6Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a:

“Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu,
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ.
Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
7Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị,
ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
8Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu
nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu,
ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị.
Gịnị mere ụjọ atụghị unu
ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.

10Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta, 11ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee. 12Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”

13Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”

14Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.” 15Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.

16Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.

Copyright information for IboBIU